AKỤKỌ ỤWA

DASUKI JI IJERI NAIRA ABỤỌ NA ỤMA ABỤỌ MEE EKPERE MEGIDE BOKO HARAM-EFCC

Abụja: Adariko Maịkel, onye ọrụ n’ụlọ ọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) , nọrọ ụbọchị Tuuzdee were gwa Ọkaikpe Husseini Baba-Yusuf nke ụlọikpe Etiti n’Abụja na Sambo Dasuki, Onye jibu ọkwa dịka Onye Ndụmọdụ n’okwu Nchekwa nke Onyeisiala Gudlọk Jọnatan nakwa Aminu Baba-Kusa, onye bụbu ótù n’ime ndị Nlekọta ụlọ ọrụ Nigeria National Petroleum Corporation (NNPC), mefuru akatamkpo ego dị Ijeri Naira Abụọ na ụma abụọ (N2. 2bn) iji mee ekpere megide ndị agha Boko Haram.

Adariko kwuru na dasuki, Baba-Kusa, ụlọ ọrụ Acacia Holdings Limited na ụlọ ọrụ Reliance Referral Hospital Limited zupuru ego ahụ, e kwesịrị iji zụta ngwa ọgụ were buso ndị Boko Haram agha.

O kwuru na Narị Nde Naira asaa na iri ise rutere ụlọ ọrụ Reliance Referral Hospital ebe ụlọ ọrụ Acacia Holdings nwetara Narị Nde Naira Isii na iri ise

O kwuru na ụlọ ọrụ Acacia Holdings mechara nwetakwa Narị Nde Naira Isii nakwa Narị Nde Naira Abụọ maka ekpere ahụ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close