AKỤKỌ ỤWA

DI M NA-ETI M IHE, GBAKWAA M Ọ́TỌ̀ N’IHU ỤMỤAKA M, OGE ỌBỤLA IWE WERE YA

Ịbadan: Oriakụ Omolola Aluko, nọrọ ụbọchị Tọọzdee n’ụlọikpe dị na Mapo, Ibadan were rịọọ alụkwaghịm n’alụmdi na nwunye ya na di ya, Segun nke ruworo ọgụ afọ maka oke mmekpa ahụ.

“Ọ na-abụ Segun tichaa m ihe, ọ gbaa m Ọ́TỌ̀ n’ihu ụmụaka anyị na ndị agbata obi.

“Nke ka njọ bụ na ọ naghị etinye ego ọbụla maka ọzụzụ ụmụaka anyị anọ ma ya fọdụzịa ileta mụ onwe m anya”

N’okwu ya, Segun kwuru na nwunye ya ahụ bụ onye ume ngwụ, onye na anọ o jikiri aka na-esi nri, na – asa ákwà.

Na mkpebi ya, Ọkaikpe Ademola Odunade gbasara ya bụ alụmdi na nwunye. Ọ hapụkwara ụmụ ha n’aka Omolola ma gwakwa na ọ ga na-akwụ nwanyị ahụ Puku Naira Iri Abụọ kwa ọnwa maka ego nri ụmụ ya tinyekwara ịkwụ ụgwọ akwụkwọ ha.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close