DI NA NWUNYE NA ỤMỤ HA ANỌ NỌZỊ N’AGBATA ỌNWỤ NA NDỤ KA ỤGBỌ OLOKO KỤNYERE ỤGBỌALA HA N’IME ÓNÙNÙ
Wọrị – Njinji jiri ụbọchị Fraidee gara aga n’Orhuwhorun dị n’Okpuru Ọchịchị Udu na Steeti Delta, oge ụgbọ oloko dara di na nwunye na ụmụ ha anọ kụkpunye ha na ụgbọala ha n’ime ónùnù.
Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na nwaamadị ahụ bu ezinaụlọ ya, kwụsịrị ụgbọala ya n’akụkụ okporo ụzọ ụgbọ oloko, na-eche ka ụgbọ oloko ahụ bu ndi njem gafere. Kaosiladị, ụgbọ oloko ahụ kụzịrị ha na ụgbọala ha kụnye n’ime ónùnù dịdebere ebe ahụ, gbara gawara onwe ya n’akwụsịghịdị chaa chaa.
Ọ bụzị ndi obi ebere nọ nso jiri ọsọ buga ha ụlọ ọgwụ ebe a na-azọzị ndụ ha maka na ha nile nwetara nnukwu mmerụahụ dị iche iche. O nwebeghi onye ma ma ha a ga-ejikwa isi ha pụta na ya bụ oke ọdachi.
N’aka nke ọzọ, ụgbọala gwepịara egwepịa nke na o nweghịkwa mmekwata.
Ndị nọ oge ahụ kwuru na ọdụ ụgbọ oloko Odjipata, ebe ya bụ ihe mberede mere anaghị arụkwa ọrụ nke mere na ndi ọrụ ndị kwesịrị imechi okporo ụzọ ma ụgbọ oloko na-agbafe anọghị ya.
Kaosiladị, Ọnụ na-ekwuru ndi Uweojii na Steeti ahụ, SP Bright Edafe, kwuru hoo!haa! na ya enwetaghị ozi ọbụla maka ya bụ nnukwu ihe mberede. O kweghikwa ịza ajụjụ ndị ọzọ banyere ya bụ ọdachi.
hmmmm, nsogbu ụwa! Onye ekoteghiri ọ̀gọ̀dọ̀ ya, ọ̀gọ̀dọ̀ ya ekotere ya. Okuke Abịama meere ezinaụlọ a ebere, zọọ ha ndụ maka na “ípírípé ndụ ka ípírípé ọnwụ mma”. Iseeeeeee!