AKỤKỌ ỤWA
DIBIA EDO AGBAGWUWO ONYE Ọ NA-EMERE ỌDESHI



Bini – Ndi Uweojii Ngalaba Steeti Edo anwụchikọwo onye dibịa gbagburu nwata nwoke ọ na-emere ọdeshi.
Ya bụ dibịa dị afọ iri na itoolu gbagburu ya bụ onye – ajọ – chi, oge ọ na-eleta ọdeshi ahụ n’ahụ ya.
Njinji ahụ jiri Onumu dị n’Okpuru Ọchịchị Akoko-Edo nke steeti ahụ n’abalị iri abụọ nke ọnwa gara aga bụ Ọgọọst.
Ọnụ na-ekwuru ndi Uweojii na steeti ahụ, SP Moses Yamu, kwuru na ya bụ nwaamadị laworo mmụọ, Alex Ezekiel bịakwutere nwa dibịa ahụ ka o mere ya ọdeshi.
“Ótù nwata nwoke, Alex Ezekiel bịakwutere dibịa ahụ maka imere ya ọdeshi. Ọ gbazịrị ya egbe iji leta ọdeshi ahụ mana nwoke ahụ tọgbọrọ n’ime ọbara ya ka mgbọ ahụ tụrụ ya ma puo ya ahụ.
“Ọ nwụzịrị n’ụlọ ọgwụ. A ga-akpụpụkwa dibia ahụ ụlọikpe maka igbu ọ́chụ̀”