AKỤKỌ ỤWA
E JIDELA NWA AFỌ IRI N’ITOOLU JI EGBE “TOY” GAA OHI


Legọs: Aka ndị Uwe Ojii akparala nwokorọbịa dị afọ iri n’itoolu, Ajayi Lateef, onye ji égbè “toy” gaa ohi.
SP Muyiwa Adejobi, Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ kwuru na e jidere ka ya na ndị òtù ya zuchara onye keke ohi n’elekere mbụ nke isi ụtụtụ Tọọzdee na Victoria Island, Legọs.
Adejobi kwukwara na ndị Uwe Ojii na – emezi nnyocha banyere okwu ahụ.