AKỤKỌ ỤWA
E JIDELA NWOKE ZURU ỊBA ÓTÙ NWOKE NA NWUNYE YA


Asaba: N’Asaba, ndị Uwe Ojii ejidela ótù nwoke, aha ya bụ Matiu, maka izu ịba ótù nwaamadị bụ Mazị Viktọ Ọdiachi na nke nwunye ya ebe ha nọ n’ụlọ nkwari akụ.
Ozi hoo!haa!! nwetara na-egosi na ekperime ahụ, onye rahụkwara n’ụlọ nkwari akụ jiri abalị gaa chịrị ịba nwoke ahụ bụ Onyenwe Ụlọ nkwari akụ ahụ nakwa uwe árá nwunye ya kechie ha n’akpa polythene.
Nwoke ahụ nwetakwara igodo ụgbọala ya n’aka ekperime ahụ.
Nwoke ahụ ekwubeghi ihe ọ chọrọ iji ịba na uwe árá ndị ahụ mee.
Oge a kpọrọ Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ, DSP Onome Onovwakpoyeya, n’ekwentị banyere okwu ahụ, e nwetaghi ya.