E JIGHI ỊKWAFU ỌBARA MARA NDIGBO – NDỊ NNỌCHITEANYA MPAGHARA ỌWỤWA ANYANWỤ NDỊDA N’ỤLỌ NZUKỌ OMEBEIWU NAỊJIRIYA


Ndị nnọchiteanya Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda (South East) n’Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Naịjiriya akatọọla ajọ ọnọdụ nchekwa na igbu mmadụ dị ugbua na Mpaghara ahụ ma kwukwaa hoo!haa!! na e jighi ịkwafu ọbara mara Ndigbo.
Ha kwuru nkea n’ozi ha wepụtara ụbọchị ụka nke ndị tinyere aka na ya gụnyere; Sinetọ Ike Ekweremadu, Sinetọ Enyinnaya Abaribe, tinyekwara ndị Omebeiwu ndị ọzọ na – anọchiteanya Mpaghara ahụ n’Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Naịjiriya.
Ozi ahụ kwuru sị, “Anyị bụ ndị nnọchiteanya Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda Naịjiriya n’Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Naịjiriya, dịka ndị ndú na ndịsonwere mpaghara a, ji ịtụnanya ekwupụta na anyị achọpụtala na ọgbaghara rịzịrị elu na ntụmadị na Mpaghara a e ji udo, ịhụnanya nakwa ịnabata ndị ọbịa n’agbanyeghị agbụrụ ma ọ bụ usoro okpukpere chi.
“Anyị agbasorola usoro iwu kwadoro iji gbaara Gọọmenti Naịjiriya àmà banyere mmegbu na mkpagbu doro anya ndị Mpaghara a na-agabiga n’usoro ọchịchị.
“Kaosiladi, obi erughikwa anyị ala maka etu ihe ụfọdụ si aga na Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda, nke bute iri ọgbaghara nakwa ihe mgbagwoju anya.
“E jighị ịkwafu ọbara mara Ndigbo. N’agbanyeghị udiri iwe a kpasuru ha, e jighị udiri imebi ihe a mara Ndigbo.
“Anyị hụkwara na okwu Nhazigharị Usoro Ọchịchị obodo ma ọ bụ nkewapụ bụzị “Okwu akpụ n’ọnụ” ugbua n’ala a maka ihi mmegide. Ndụmọdụ anyị bụ na ndị nile na-eme nkea ga-eme ya n’ụzọ n’emegideghi iwu Naịjiriya nakwa n’ụzọ udo.
“Anyị na-ezigara ndị nile ndị ha hụrụ n’anya, ndị enyi nakwa ikwu na ibe ha tufuru ndụ ha na ihe ọghọm ndi a ozi nkasi obi”
Ha katọkwara ọgbaghara na igbu mmadụ n’udi ọbụla ma kpọkukwaa Onye Nlekọta Izugbe ndị Uwe Ojii Naịjiriya ka o mee nnyocha miri emi, iji chọpụta ndị bụ ndị òjì égbè ana amaghị ama, ndị foro ntụtụ taa ibute nghasa ọchịchị obodo na Mpaghara ahụ.
Ha nyekwara ndị oru nchekwa ndụmọdụ ka ha ghara iji aka ike were na-arụ ọrụ iweghachi udo na Mpaghara ahụ.