AKỤKỌ ỤWA

E JIRILA NTARAMAHỤHỤ GBUO NWOKE BENUWE MAKA EBUBO OHI EWU

Makurdi: Òtù nwoke, Ordue Akume abụrụla onye nwụnyụrụ anya ụbọchị Tuuzdee na Lessel dị n’Okpuru Ọchịchị Ushongo, Benuwe Steeti maka ntaramahụhụ ọ natara n’aka ndị na-ebo ya ebubo izu ohi ewu.

Ozi hoo!haa!! nwetara na-egosi na nwanne nwoke ahụ laworo mmụọ nke ikpeazụ gara kpesara ndị ntorobịa obodo ahụ na ewu ya na – efu efu.

Middle-aged man tortured to death in Benue over missing goat

                                                         

Ha gazịrị n’arụsị, ebe a gwara ha na ọ bụ nwoke ahụ zuru ewu ahụ.

Kaosiladi, nwoke ahụ laworo mmụọ gọrọ ágụ̀gọ́, na o nweghị ewu ọbụla o zuru. Ndị ntorobịa ahụ malitere inye ya ntaramahụhụ dị iche iche ka o were kweta.

Nwoke ahụ nọzị ha n’aka koropu. Ka ha hụrụ na o kulitenwughịkwa, ha bugara ozu ya n’ogige ahụike nọ n’ebe ahụ tupu ndị Uwe Ojii kpụrụzịa ha.

Middle-aged man tortured to death in Benue over missing goat

N’okwu ya, Onyeisi Oche Okpuru Ọchịchị Ushongo, Hon. Asawa, katọrọ arụrụala ụmụ okorobịa isii ahụ ma kwukwaa na a ga-ekpe ha ikpe site n’usoro iwu.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close