AKỤKỌ ỤWA
E LIWO CHIZỌBA ONYE NDỊ SOJA GBAGBURU NA NKWAFU ỌBARA LEKI


Nsụka: Anya mmiri zoro ka mmiri ụbọchị Wenezdee oge e liri Nwa-ada Chizọba Francisca Agụ, ótù n’ime ndị soja gbagburu na Nkwafu Ọbara Leki ka ha nọ Ngagharị iwe #EndSars.
Ndị nile bịara elimozu nwa agbọghọ ahụ bụ onye ọ́kụ́ Ọ̀gwụ̀ (pharmacist) na be ha na Nkpologwu, Ibenda Obollo Eke dị n’Okpuru Ọchịchị Udenu nke Enugwu Steeti jupụtara n’obi mgbawa nakwa arịrị.
Naịjiriya gwụrụ ike! Ruo taa, ma Sanwo-Olu bụ Gọvanọ Legọs Steeti ma ndị soja ka nọ na-agụgọ.