E TIELA NWANYỊ DI YA ZỤNYERE ỤGBỌALA E ZURU EZU N’ỤBỌCHỊ NCHETA ỌMỤMỤ YA GWOO GWOO

Oriakụ Thembisile Ngozo, abụrụwo onye chi ọma butere ọdachi.
Nwanyị a bụ onye nọọsụ na Johannesburg, mba Sawụt Afrịka ka di ya zụnyere ụgbọala Toyota Yaris e zuru n’ohi n’amaghị ama dịka onyinye ụbọchị ncheta ọmụmụ ya.
Ngozo kwuru na ya na di ya hụrụ ozi azụmahịa ụgbọala ahụ na Facebook , n’aka Freeman Auto.
Ọnụ ahịa ụgbọala Toyota Yaris ahụ nọ na R35 000 mana ha kwegidere ọnụ nweta ya na R30 000.
Ngozo nya ụgbọala ahụ gaa ọrụ n’abalị iri n’atọ nke ọnwa Ọgọọst iji mee ka ọhaneze soro ya ṅụrịa maka na o sozi na ndị nwere ụgbọala.
“A nụrụ mkpọtụ si n’ụgbọala m n’ebe ndọsara ya. Ka m pụtara, a hụrụ m nwoke na nwanyị nọ n’ime ụgbọala m. Ka m jụrụ ihe ha nọ n’ime ụgbọala m, ha malitere tiwe m ihe.
“Ha kụchara m ihe buru ụgbọala ahụ laa. Ka anyị kpọrọ onye resịrị anyị ụgbọala, gwa ya na ndị buuru ụgbọala ahụ sị na ọ bụ nke ha, ọ sịrị anyị agala nke ndị Uwe Ojii kama anyị bịa ka anyị na ya hụ”
Echi ya, ka ha rutere na nke onye ahụ na-ere ụgbọala, ha hụrụ nwoke ahụ ya na nwunye ya tiri ha ihe. Ha hụkwara ya bụ ụgbọala ha zụburu ebe ahụ.
Justin, onye ahụ na-ere ụgbọala rịọrọ ha ka ha buru ụgbọala ọzọ. O kwuru na onye resịrị ya ụgbọala ahụ chị akwụkwọ ya nile bịa ma kwukwaa na ọ bụ nke enyi ya nwanyị. A maghị m na o nweteghị ikike nwanyị nwe ụgbọala ahụ.
Mokgobodi, onye nwe ụgbọala ahụ sịrị na ya bugara ya nke mekaniki.
“Ka m bịara iburu ụgbọala m o bidoro kọwara m ogologo akụkọ. A kpọrọ m ụlọ ọrụ ngwa nchekwa ụgbọala (car tracker) m, ndị gwara m ebe ụgbọala dọsa. A gazịrị m buru ya n’ike”