AKỤKỌ ỤWA
EBE EJIDERE KANỤ BỤ NA KENYA


Reno Omokri, onye bụbu Onye Inyeaka Onyeisiala rịturu n’ọkwa bụ Gudlọk Jọnatan ekwuola na ọ bụ na mba Kenya ka ejidere Onyeisi òtù IPOB, Mazi Nnamdi Kanu.
Omokri kwuru ụbọchị Tuuzdee na ozi o nwetara site n’aka ndị mgbaàmà ya na Briteenụ gosiri na ọ bụghị na Briteenụ ka a nọ jide Kanu, na ọ bụ na Kenya.
O dere sị:”Mụ na ótù onye welitere isi n’ọchịchị mba Briteenụ ka kpachara ugbu a.
“Ọ sịrị na ebe e jidere Kanụ bụ na Kenya. Onye ọbụla ma mba Briteenụ mara na ọ bụ ebe a na-eme ihe n’usoro iwu.
“Na Briteenụ, tupu e jide onye ọbụla kpọghachi ya na mba ebe a chọrọ ikpe ya ikpe, a ga-ebu ụzọ kpụpụ ya ụlọikpe iji nata ikike”