EBỌNYỊ GA-ABA APC, MA PDP JỤ IKENYE MPAGHARA ỌWỤWA ANYANWỤ ỌKWA ONYEISIALA AFỌ 2023


Abakaliki: Ọnụ na-ekwuru Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Ebonyi Steeti, Rt. Hon. Francis Ogbonna Nwifuru enyela ótù ndọrọndọrọ ọchịchị PDP abalị asaa ikenye mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjiriya ikike ịzọ ọkwa Onyeisiala n’afọ 2023 n’aha ya.
N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ taa n’Abakiliki n’aha ndị Omebeiwu Steeti ahụ, Nwifuru kwuru sị, “Kemgbe a malitere ọchịchị onye kwuo uche ya n’afọ 1999, ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nọgidere na PDP na – enyekwa ndị ọbụla ji aha ótù ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ azọ ọkwa Onyeisiala nkwado zuru oke site na ịtụnyere ha kwanarị ótù Narị (100%).
“N’ihi ikpe nkwụmọtọ nakwa ime ihe ziri ezi, o kwesịrị ka PDP kenye mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ikike ịzọ ọkwa Onyeisiala n’aha ya.
Nwifuru kwukwara na ha agaghị ele anya n’azụ ịhụ na ha mere íhé pụtara ìhè iji hụ na a kwa nyeere omenala ótù ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ ùgwù.
Site na okwu ya, o doro anya na nke bụ iji kwado ohere maka Gọvanọ Devidi Ụmahị, Gọvanọ Steeti ahụ were banye APC, dịka kepukepu si ekwu kemgbe abalị ole mole, iji zọọ ọkwa Onyeisiala n’afọ 2023.
Hmm, ugo eberela na mgbagbu