EBUMNOBI “OPERATION RESTORE PEACE” BỤ IGBUKPỌ NDỊ BE ANYỊ – IPOB


Onyeisi òtù Indigenous People of Biafra, IPOB, Mazi Nnamdi Kanu, ekwuola hoo!haa!! na ebumnobi atụmatụ nchekwa nke Onye Nlekọta Izugbe ndị Uwe Ojii Naịjiriya, Usman Alkali Baba malitere n’Enugwu ụbọchị Tuuzdee bụ maka igbukpọ ndị ndị Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda.
N’ozi nke Emma Powerful, Odeakwụkwọ Mgbasa ozi IPOB zipụrụ ụbọchị Tọzdee, Kanu kwuru na ya bụ atụmatụ nchekwa ahụ bụ agha ka e ji ya ebuso ndị be anyị.
“Òtù Indigenous Peoples of Biafra (IPOB) nke n’okpuru Onyeisi anyị, Mazi Nnamdi Kanu arụtụwo aka n’ọgbakọ nchekwa e nwere n’Asọ Rọk, nke onye ahụ na-azazị aha Buhari na ndị isi Ọchịagha ya nwere, ebe ha nọrọ nwee mkpebi nzuzo miri emi banyere ndị Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ obodo a bụ ogige ụmụ anụ ọhịa.
“O nweghị onye mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda nọ n’ọgbakọ ahụ ebe ha kpebiri ịga n’ihu n’atụmatụ igbukpọ ndị ntorobịa Ndigbo na ndị òtù Biafra, n’agbanyeghị nkatọ ụwa nile katọworo atụmatụ ahụ nke Gọọmenti Etiti ndị Fulani wepụtara”
IPOB kwukwara na ebe ọ bụ na ha abụghị ukwu osisi, na ndị be anyị agaghị ala azụ na ịlụ ichekwaba ndụ ha n’aka ndị a na-ebuso ha agha.