AKỤKỌ ỤWA

EBUTUWO N’ỌKWA INSPEKỊTỌ JI ỤRA SACHIE NWOKE MMADỤ IHU N’IHU EZINỤLỌ YA

Ìgwéọcha – Ndi Uwe Ojii ebutuwo n’ọkwa onye òtù ha ji ụra were sachie ótù nwaamadị ya n’ezinụlọ ya so n’ụgbọala aga ụka ntị n’okporo ụzọ dị n’Emuọha, Rivas Steeti.

Ozi sitere n’aka Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii Naịjiriya,CSP Muyiwa Adejobi kwuru na ya bụ onye Uwe ojii bụ Inspekịtọ Siaka ka ebutuziri n’ọkwa dịka Saajentị maka inye ndị Uwe Ojii ajọ aha site na etu o siri maa nwaamadị ahụ na-agara onwe ya ụra n’ihu ezinụlọ ya ma mekwaa ya akaja.

Onyonyoo ya bụ ihe mere n’abalị itoolu nke ọnwa Eprel afọ a wusara ebe nile n’ọba ozi mmekọrịta nke mere na ndị isi ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii jiri leba ya anya, iji dọọ ndị ọzọ aka na ntị.

Onye òtù ya, Saajentị Ndiwa Kpuebari, onye gbachiri nkịtị oge ihe ahụ na-eme nwetakwara ịdọ aka na ntị.

Adejobi kwukwara na -aga esi Rivas tụga ndị Uwe Ojii ahụ Steeti ọzọ.

Ịnspekịtọ Gburugburu ndị Uwe Ojii Naịjiriya, Usman Baba dọkwara ndị Uwe Ojii aka na ntị ka ha na arụ ọrụ dịka ndị e nyere ọzụzụ nakwa site n’ịsọpụrụ ikike dịịrị mmadụ.

Hmmm, otu a ka ọ ka mma, ka ndị Uwe ojii anyị mụta ihe.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close