EFCC EJIDELA NWA YAHOO NA “PASTOR” YA MAKA IGWUNAHỤ MMADỤ EGO DỊ N12.7NDE

Oshogbo : Ụlọ ọrụ Economic and Financial Crimes Commission(EFCC) ejidela ótù onye Yahoo, Adebayo Olawale ya na Ụkọchukwu na-ekpere ya ekpere, Gbenga Adesoju, n’Ile-Ife, Osun Steeti maka ịnapụ ótù nwaamadị, Umar Hayatu nke Lafiya dị n’Okpuru Ọchịchị Dukku nke Gombe Steeti ego dị Nde Naira Iri n’abụọ na ụma asaa (N12.7m).
Olawale na Adesoju ghọgburu Umar site na ikwe ya nkwa ọrụ nakwa nnukwu ụgbọala.
Ọnụ na-ekwuru ụlọ ọrụ EFCC, Mazị Wilson Uwajaren kwuru sị,
“Adebayọ, onye bụ isi sekpụ ntị jiri aha adigboroja Facebook dị iche iche dịka Williams Angelina na Omolola Adebayọ were ghọgbuo Umar ikweta na nna ya nwere ụlọ ọrụ n’ala bekee, na ya ga-eme ya Onye Nlekọta ngalaba ụlọ ọrụ ahụ nke Legọs.
“O zigakwara ya bụ “mugu” onyonyoo ụlọ nakwa ụgbọala dị iche iche o kwuru na a ga-enye ya dịka Onye Nlekọta ụlọ ọrụ ahụ.
Nnyocha EFCC na-egosi na ego dị N12, 798, 387.00, sitere na ya bụ chandum nọ n’ọ́dọ̀ ego ụlọ akụ onye Yahoo ahụ.
Adesoju, onye na-ekpere ya ekpere nwetakwara ótù ụgbọala BMW, ala nakwa ọkpụrụkpụ ego dị ka òkè ya.
Uwajaren kwuru na-akpụgazịrị mmadụ abụọ ahụ a na-enyo n’ụlọ ọrụ EFCC na Legọs ụbọchị Tọọzdee.