ÉGBÈÍGWÉ AGBAGBUWO UMUAKWỤKWỌ SEKỌNDỊRỊ ATỌ NA-AGBA BỌL N’ỌKPỤNỌ



Ọka – Égbèígwé nọrọ ụbọchị Satọdee gbagbuo ụmụakwụkwọ sekọndịrị Tansi College, Ọkpụnọ, Ọka, Anambara Steeti, ebe ha na-agba bọl ka mmiri na-ezo.
Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ụmụakwụkwọ ahụ na onye nkụzi bọl (coach) ha mechara ọmụmụ bọl tupu ọ lawa.
Kaosiladị, ụfọdụ nọkwara gbara bọl gawa n’ihu. Ka mmiri na-achọ izo, amụma chara, égbèígwé were gbaa.

N’ime ụmụaka ahụ na-agba bọl oge ahụ, mmadụ itoolu ka égbèígwé ahụ gbaturu n’ala. Onye nkuzi hụrụ ihe mere tìrì mkpu mere ndi mmadụ ji gbata buga ha ụlọ ọgwụ.
Mmadụ atọ nwụnyụrụ anya ebe isii ndị ọzọ mechara bilie, nọrọzie n’ụlọ ọgwụ ebe a na-elekọta ha anya.
Ótù nwanyị, Oriakụ Grace Egbo, onye bidebere ebe ahụ sịrị na ụjọ jizi ndị nile bi n’akụkụ ebe ahụ kemgbe ahụ.
Chai! Nke a abụ ajọ chi ka ọ bụ anụghị ntị? Ka mkpụrụ obi ha zuru ike na ndokwa! Iseeeeeee!