Wilfred Ndidi, nwa-afọ Naịjiriya na-agba etiti n’ótù egwu bọl Leicester City nke mba Ịnglandị nakwa ótù egwu bọl Super Eagles nke Naịjiriya ekwuola na egwu na-atụzị ndị bọl nakwa ụmụ amaala Naịjiriya ndị ọzọ bi ofesi ịlọta maka egwu izute ọnwụ ha n’aka ndị Uwe Ojii SARS.
N’ozi ya taa na Twitter, Ndidi kwara arịrị etu ndị kwesịrị ịna echekwa ndụ ndị ntorobịa si bụrụzịa ndi na edula ha mmụọ.
O dere sị: “#EndSARS ka e mechie SARS iji zọọ ndị Naịjiriya ndụ… Egwu ịlọta ụlọ na-atụzị anyị ebe ndị kwesịrị ịchekwaba anyị na – egbuzi anyị. Na mmadụ kpara isi, dị mma n’anya abụghị arụ”