EJIDELA FADA NỌ N'”ALTAR” ENWE MMEKỌAHỤ MMADỤ ATỌ
Ndị Uwe Ojii ejidela ụkọchukwu ndị Ụka Katọliki ya na umu nwanyị abụọ na – enwe mmekọahụ n’ebe nchụàjà ụlọ uka nke ha na – ese n’onyonyoo iji mee ihe nkiri akwamiko (pornograhy) n’abalị iri atọ nke ọnwa Septemba afọ a.
Ótù onye na-agafe ụlọ ụka Katọliki ndị nsọ Pita na Pọl na Pearl River, Louisana, mba Amerịka si na windo sete Fada Travis Clark (afọ 37) na Melissa Cheng (afọ 23) tinyere Mindy Dixon (afọ 41),onye omebe ihe nkiri akwamiko a maara ama.
N’agbanyeghị na mmekọahụ ha nwere abụghị na mmanye, ndị Uwe Ojii jidere mmadụ atọ ahụ maka “ime ihe ruru ínyí n’ebe nchụàjà ụlọ uka ahụ, ebe ndị na-agafe n’okporo ụzọ na-ahụta”
Aachbishọọpụ Greg Ayman kwụsịrị ụkọchukwu ahụ ọrụ tupu gaa ụlọ ụka ahụ ịga mee “emume ngwụcha ebe nchụàjà ahụ”
Chukwu Nna! Nke a bu aru