AKỤKỌ ỤWA

EJIDEWO NWANYỊ OGUN STEETI RERE NWA YA DỊ ÓTÙ AFỌ N’ỌKARA IJI KWỤGHACHI EGO MGBAZINYE ỤLỌ AKỤ

Abiokuta – N’Ogun Steeti, ndi Uwe Ojii ejidewo Oriakụ Olaide Adekola, onye dị afọ iri atọ na atọ maka ire obere nwa ya, Moridiat, onye nke dị otu afọ na ọkara.

Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe na steeti ahụ, Abimbola Oyeyemi kwuru ụbọchị Mọnde na di nwaanyị ahụ, Nureni Rasaki wetara mkpesa n’aka ndị Uwe ojii na nwaanyị ahụ enweghị ihe ikwu ebe nwa nwanyị o ku gaa Legọs nọ.

Ka ndị Uwe ojii gbara ya ajụjụ ọnụ, o kwupụtara na ya resịrị mmadụ nwa ha na Legọs iji kwụghachi ego mgbazinye dị Narị puku Naira Iri isii ọ natara ndị Ụlọ akụ.

Kaọdịtaa, ndị Uwe Ojii ka na-esi imi n’ala iji nwụchikọọ ya bụ nwanyị zụrụ obere nwatakịrị ahụ.

TỤFỊAKWA! Arụ!

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close