AKỤKỌ ỤWA

EJIDEWO ỤMỤ AKWỤKWỌ SEKỌNDỊRỊ ỤMỤ NWANYỊ ANỌ BỤ ISI NDỊ MMADỤ IJI MEE Ọ́GWỤ̀ EGO

Legọs: Aka akparala ụmụaka ụmụ nwanyị anọ na Legọs, ndị e jidere ka ha bu isi ndị mmadụ n’akpa akwụkwọ ha maka iji gwọọ ọ́gwụ̀ ego.

Obere ụmụaka ụmụ nwanyị ndị ahụ bụ ụmụ akwụkwọ ótù Ụlọ akwụkwọ sekọndịrị achọghị ịkpọ aha ya bụ ndị nwere ịdị n’agbata afọ iri na ise na afọ iri n’isi.

Ọ bụ onye ọ̀kwọ́ ụgbọala “taxi” butere ha ụlọ akwụkwọ bu onye gbara ha àmà.

Site n’ozi hoo!haa!! nwetara, nwaamadị ahụ chọpụtara na ụmụaka ahụ nwere ihe ha bu na-esi ísì ọjọọ were gwa ndị nche nọ n’ọnụ ụzọ ámá ụlọ akwụkwọ ahụ, ndị nyochazịrị akpa akwụkwọ ụmụaka ahụ were hụ isi mmadụ ha bucha.

A kpọzịrị ndị Uwe Ojii ndị bịara kpụrụ ha. Ka ọ dị ugbu a, Ọnụ na – ekwuru Ndị Uwe Ojii Ngalaba Legọs Steeti, CSP Adekunle Ajisebutu enwebeghị ihe o kwuru banyere okwu ahụ.

Hmmm! Njọ kacha njọ adakwasịla obodo a!

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close