EJIGHI ỌNỤ AMACHI NDỊ NCHỊ EHI, MEBENỤ IWU – IRF NA-AGWA NDỊ GỌVANỌ MPAGHARA NDỊDA NAỊJIRIYA


Ọka: Òtù Igbo Renaissance Forum (IRF) ekwuola hoo!haa!! na imachi ndị Fulani nchị ehi iji ụkwụ achịgharị ehi na Mpaghara Ndịda Naịjiriya abụghị ihe e ji sọọsọ okwu ọnụ eme maka na “ejighi ọnụ etinye azụ n’ofe”
N’ozi nke Onye Nlekọta Izugbe òtù ahụ, Nze Ugochukwu Akpe Ọnwụka tinyere aka, nke ha zipụrụ ụbọchị Tuuzdee, IRF kwuru sị:
“Ekele dịrị ndị Gọvanọ Mpaghara Ndịda Naịjiriya maka ịbịakọta ọnụ were nwee ọgbakọ n’Asaba, Delta Steeti.
“Mkpebi ha banyere imachi ndị nchị ehi magburu onwe ya. Kaosiladi, ejighi okwu ọnụ amachi ndị nchị ehi.”
IRF kwuru na o nwere olileanya na nke a agaghịkwa adị ka “égbè ọnụ” ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda gbbachara ọnwa olemole gara aga banyere imachi ndị nchị ehi.
“Ọ bụrụ na site ugbua ruo ngwụcha ọnwa Mee, afọ a, na Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Steeti nile nọ na Mpaghara Ndịda Naịjiriya amalitebeghi usoro imebe iwu Mmachi Nchị Ehi mara na ndị Gọvanọ Mpaghara Ndịda Naịjiriya bịakwara ịgba égbè ọnụ nakwa ịsụ ogologo bekee”