AKỤKỌ ỤWA

EKPA NA NDI ÓTÙ YA JIZI BIAFRA, DUM NỌRỌ N’ỤLỌ AKPARA EGO -ABARIBE

Abuja – Sinetọ Enyinnaya Abaribe nke na- anọchite anya Mpaghara Ọdịda Anyanwụ Abịa ekwuwo hoo!haa!! na Saịmọn Ekpa, onye nọ na mba Finland ebuso Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijiriya Agha iyiọ̀hàégwù(terrorism) na ndị ótù ya ndi ọzọ jizi Biafra akpara ego.

“Ekpa na ndị ótù ya ndị ọzọ jizi okwu banyere Bịafra akpara ego. Ha na -anapụkwa ndị mmadụ ego site n’atụmatụ Dum Nọrọ n’ụlọ.

“Nke a mere ha ji sie ọnwụ ịga n’ihu n’atụmatụ ahụ, n’agbanyeghị na Mazị Nnamdị Kanụ, onye ndú IPOB, onye ha sị na ha jiri maka mgbapụta ya na nga were tie ya bụ iwu Dum Nọrọ N’Ụlọ ahụ agwala ha hoo!haa! ka ha kwụsị ya.

“Ị gakwaa n’ọbaozi mbaụwa ( internet), ị ga-ahụkwa ebe Ekpa na ndị ótù ya na-arịọ nkwado ego iji gaa n’ihu na mbọ ha sị na ha na-agba iji hụ na a tọhapụrụ nwanne anyị Kanụ”.

Hmm, oge n’adịghị anya, aka ga akpara onye aghụghọ; Ekpa , uche gị dịkwa ya oooo!

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close