EMEZIGHI ỌDỤ ỤGBỌ MMIRI MPAGHARA ỌWỤWA ANYANWỤ NA-EBUTE “TRAILER” IMEBISI OKPORO ỤZỌ – JỊỌJỊ MỤỌGHALỤ


Abụja : Onye Nlekọta Ukwu nke ụlọ ọrụ Nigerian Inland Water ways Authority (NIWA) Ichie Jịọjị Mụọghalụ ekwuola na emezighi ọdụ ụgbọ mmiri dịgasị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjiriya na – ebute ụgbọala ibu “trailer” imebisi okporo ụzọ awara awara dịgasị na Naịjiriya.
Mụọghalụ kwuru nkea n’ụtụtụ Tuuzdee , oge ọ na-ekwu okwu na Mmemme “Good Morning Nigeria” nke ụlọ mgbasa ozi NTA na-eme.
“Ọkara ibu ibu nile na-abata ọdụ ụgbọ mmiri Legọs bụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ka ha na-aga, Ọnịcha na Aba.
“Nke a pụtara na ígbé ibu (container) Puku abụọ bata Legọs, mara na ọ pụtara na ụgbọala ibu òtù puku ga-agba ogologo okporo ụzọ were gaa mpaghara Ọwụwa Anyanwụ”.
“N’agbanyeghị ka okporo ụzọ ndị a si sie ike, ha agaghị adịnwu mma gafee udu mmiri atọ maka nnukwu ibu ha na-ebu”.
O kwukwara na kemgbe abalị iri n’isii ọnwa Ọktoba afọ a, na ụlọ ọrụ ya amalitewo iji ụgbọ mmiri ibu (barges) were si n’ọdụ ụgbọ mmiri Onne na-ebubatazi ígbé ibu n’ọdụ ụgbọ mmiri Ọnịcha.
N’okwu nke ya, Mazị Manni Ọchugboju, onye ọkachamara n’okwu Njem kwara arịrị na – etu Gọọmenti Etiti siri kpachara gbakụta ọdụ ụgbọ mmiri nikec