AKỤKỌ ỤWA
#ENDSARS:NWA AGBỌGHỌ SARS GBAJIRI ỤKWỤ NỌ N’OCHE NGWỤRỌ EME NGAGHARỊ IWE

Legọs: Ótù nwa agbọghọ ndị SARS gbajiri ụkwụ sonyere ndị ntorobịa ibe ya n’ime ngagharị iwe #EndSars megide ndị Uwe Ojii ogbu ọchụ ahụ n’ejighi ndụ mmadụ kpọrọ ihe ọbụla.
N’afọ 2017, mgbọ tụtara Nwa-ada Nkechi Chijioke ka ọ kwụ na-eche ụgbọala ịga ọrụ n’ụtụtụ ụbọchị ahụ.
Ndị SARS na-achụ ndị ntorobịa ọsọ malitere ịgba égbè aghara aghara, meziri mgbọ égbè jiri tụọ ya n’ùkwù.
Kemgbe ahụ, ọ naghị aganwuzi iji. Nke ka njọ bụ na ndị SARS gbara ya égbè ahụ akwụsịghịdị leta ya, ma ya fọdụzịa ibuga ya ụlọ ọgwụ.