AKỤKỌ ỤWA

ESEMOKWU ỌHANAEZE: CONCERNED IMEOBI MEMBERS AMALITEWO IDOZI YA

Enugu: Ndị Concerned Imeobi Members, (CIM) nọrọ ụbọchị Tọzdee were gaa n’ihu n’ebumnobi ha bụ idozi esemokwu dapụtara n’òtù Ọhanaeze Ndigbo site na nhọpụta ha mere n’ọnwa Jenụwarị afọ a.

Nkewa batara n’Ọhanaeze Ndigbo oge ha nwere nhọpụta abụọ;nke e mere n’Enugwu n’abalị itoolu nke ọnwa Jenụwarị, ebea họpụtara Ichie Chidi Ibe, na nke e mere n’Owere n’abalị iri ebe a họpụtara Ọkammụta Jịọjị Obiọzọ.

N’ihi ya, ndị Concerned Imeobi Members (CIM) nọrọ ụbọchị ahụ were hiwe Kọmitii Ime Udo ndị Ụkọchukwu nke Aachbishọọpụ Antoni Obinna, Aabishọọpụ ụka Katọliki n’Owere nọ n’isi ya, Osote ya bụ Aachbishọọpụ Ịmanụel Chukwuma nke ụka Angịlịkan, Mpaghara Enugwu, odeakwụkwọ Kọmitii ahụ bụ Aachbishọọpụ Chibụzọ Opoko nke ụka Methodist.

N’okwu ya n’oge ahụ, Ichie Ụma Eleazụ kwuru na ha bụ ndị okenye agaghị anọ ihe ana emebi.

“Ihe a abụghị oge e kwesịrị inwe ịlụ ọgụ ọbụla n’etiti Ndigbo. Sọọsọ ndị Imeobi agaghị edozinwu esemokwu sitere na nhọpụta ahụ. Ya mere anyị ji kpọkuo ndị Ụkọchukwu ka ha nye aka wetakwa udo na ịdịnotu n’Ala-Igbo”

N’okwu nke ya, Aabishọọpụ Chibụzọ Opoko kelee ndị Imeobi maka ịkpa udo ma kwukwaa na ịhụ na e kpọkọtara nkewa nile dị ugbu a n’Ọhanaeze bụ ọrụ dịịrị ha.

Ndị òtù Kọmitii Ime Udo a gụnyere Aachbishọọpụ Valerian Okeke nke ụka Katọliki n’Ọnicha, Bishọọpụ Kristova Ede, Bishọọpụ Gọdfrị Ọna nke ụka Katọliki na Nsuka, Aabishọọpụ Devidi Ọnụọha nke Ụka Angịlịkan n’Owere, Bishọọpụ Obi Ọnụbọgụ, wdg.

Ụfọdụ ndị Concerned Imeobi Members gụnyere Ichie Uma Eleazu, Onyeisi Oche, Omenka Kris Okoye, Onye Nhazi, Dọkịnta Ebraham Nwankwo, Odeakwụkwọ, Ọkammụta (Ụkọchukwu) Chinedu Nebo, Ichie Nduka Eya, Ichie K. U. Kalu na Ọkammụta Pat Utomi.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close