EZENWANYỊ ELIZA KWESỊRỊ ỊTA IKIKIRI EZE, N’ENWEGHỊ EZUMIKE MAKA ARỤ MKPOCHAPỤ MBA MEGIDE BIAFRA



Ọkammụta Uju Anya ekwuwo hoo!haa! na Ezenwanyị Eliza nke Abụọ, Ezenwanyị mba Ịnglandị kwesịrị ịta ezigbo ikikiri eze ruo n’ọnwụ, n’enweghị ezumike mkpụrụ obi maka arụ mkpochapụ mba megide Biafra.
N’agbanyeghị nkatọ sochiri ya bụ okwu ya na Twitter, Ọkammụta Anya, onye nọ n’Ala – Igbo n’oge agha Biafra kwuru sị:
“Kedụ ihe m ga-eji metere onye soro hụ maka mmegbu na mkpochapụ mba megide ndị be anyị bụ Ndigbo n’oge agha Biafra ebere.
“Onye ọbụla tụrụ anya mụnwa imere nwaanyị ahụ ọmịiko na-arọ nrọ”
Ọkammụta ahụ bụ onye mba Amerịka kwuru na na ya n’ụmụnne ya ji anya ha hụ ihe ndị mba Briteenụ soro mee Ndigbo n’oge agha Biafra, nke ha ka bu apa ya ruo taa.
Jeff Bezos, onyenwe Amazon katọrọ okwu nwanyị na Twitter kwuo sị:
“Chai! Kedụ ka onye na-achọ ọdịmma mba ụwa ga-esi were kwuo udiri okwu a”
Ọkammụta Anya zaghachiri ya sị:
“Ka onye ọbụla gị na oke anyaukwu gị merụworo ahụ n’ụwa a cheta gị etu m si echeta ndị mba ọzọ chịrị m ọchịchị nchigbu”
Twitter wepụrụ ya bụ okwu Ọkammụta Anya maka imegide iwu ha.