AKỤKỌ ỤWA

EZINỤLỌ M GBAHAPỤRỤ M, TỤNYERE PITA OBI NA NHỌPỤTA ONYEISIALA

Gọvanọ Devidi Ụmahị nke Ebọnyị Steeti akọwaala na ndị ezinụlọ ya gbahapụrụ na nhọpụta maka ọkwa Onyeisiala site na ịtụnyere Mazị Pita Obi, onye zọrọ ọkwa ahụ n’aha ótù ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Party, LP, karịa Sinetọ Bola Tinubu nke ótù ndọrọndọrọ ha bụ All Progressives Congress,APC.

Ụmahị nyere nkọwa ahụ oge ọ na-ekwu okwu n’ụlọ mgbasa ozi Channels TV ụbọchị Mọnde.

O kwuru sị,”A tụghị m anya na LP ma ọ bụ ótù ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla ga- enweta mmeri na nhọpụta ọbụla n’Ebọnyi Steeti maka udiri ọrụ dị egwu anyị rụrụ.

“Kaosiladi, ndị Ebọnyị tụnyeziri APC na nhọpụta ndị ọzọ”.

O kwukwara na ihe mere ndị mmadụ ji tụnyere LP bụ maka na ahụhụ nakwa agụụ karịrị n’obodo.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close