FMC OWERE EBEWO NWA DỊ ỌNWA ABỤỌ AKA KA NNA YA GBAJIRI YA AKA MAKA ỊKPỌTE YA N’ỤRA



Owere: N’Owere, iwe n’ọnụma jupụtara ndị mmadụ n’obi banyere ótù nwata nwoke, Confidence Amatobi, onye gbajiri obere nwa ya nwoke dị sọọsọ ọnwa abụọ aka.
Ozi hoo!haa!! nwetara na-egosi na ya bụ nna arụrụala, onye riworo mbọ mbọ ọsọ sịrị na ya nwa ya na-eme mkpọtụ oge ya (nna ya) na-arahụ ụra.
A kkpọrọ ya bụ nwata gbaga n’ụlọ ọ́gwụ̀ Federal Medical Center, FMC, Owere, ebe ndị dibịa oyibo bepụrụ aka na-erezi ere, iji zọta ndụ ya.

Oriaku Ụka Ụkachi, Onye Nlekọta ụlọ ọrụ Gọọmenti Etiti na – ahụ maka Ikike dịịrị Mmadụ, National Human Rights Commission, Ngalaba Imo Steeti gara leta nwatakịrị ahụ na nne ya n’ụlọ ọ́gwụ̀ ụbọchị Tuzdee.
Oriakụ Ụka kwuru sị, “Anyị na-akpọku ọhaneze ndị nwere obiọma ka ha gbatara nwatakịrị ahụ na nne ya ọsọ enyemaka.
“N’ótù aka ahụ, anyị na – arịọkwa ndị Uwe ojii ka ha hụ na nwaamadị ahụ, onye riworo mbọ mbọ ọsọ Tara ahụhụ maka arụ ọ kpasara obere nwatakịrị ahụ”