AKỤKỌ ỤWA

FRANK NWEKE EKWEELA NKWA ỊHỤ NA SỌỌSỌ NDỊ Ọ GA-EJI RỤỌ ỌRỤ BỤ NDỊ MARA ỌRỤ, MA Ọ BỤRỤ GỌVANỌ ENUGWU

Enugwu: Onye ji aha ótù ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Grand Alliance, APGA azọ ọkwa Gọvanọ n’Enugwu Steeti, Mazị Frank Nweke ekweela nkwa ịhụ na sọọsọ ndị mara ọrụ bụ ndị ọ ga-eji rụọ ọrụ, ma ọ bụrụ gọvanọ steeti ahụ.

Nweke kwere nkwa a ụbọchị Tuzdee na mmemme mmalite izu ụka iwu nke afọ 2022 nke òtù ndị ọkaiwu ala Naịjiriya bụ Nigerian Bar Association, NBA, n’asụsụ Bekee, ngalaba Enugwu mere nke isiokwu ya bụ “Ọrụ dịịrị ndị ọkaiwu n’oge nhọpụta n’ime ọchịchị onye kwuo uche ya”

N’okwu ya nke gbadoro ụkwụ na iweta ezigbo usoro ọchịchị na ndị ndú n’Enugwu, nwaamadị ahụ chọ́rọ́ iweghara ọkwa ọchịchị Enugwu Steeti n’aha APGA kwuru hoo!haa! na ebumnuche ya bụ ịpị aka apị kpọkọba ndị maara ọrụ, nwekwaa ezigbo akparamagwa iji hụ na nkwa nile o kwere ndị steeti ahụ bịara na mmezi.

“A gaghị m ebutere ụlọ ọrụ Gọvanọ mkparị site na itinye aka n’ọrụ ndị m kpọlitere n’ọkwa. Kama sọọsọ ndị m ga-akpọlite n’ọkwa bụ ndị nwere ezigbo aha, ndị mara ọrụ dịkwa njikere ịrụ ọrụ, a ga m enyekwa ha ohere iru ọrụ ha.

“Ụlọ ọrụ Gọvanọ agaghị na-ahụ maka inye ọrụ ngo. Usoro ọchịchị m ga-enye mpaghara nakwa nkeji ọchịchị ọbụla ohere ịrụ ọrụ ya n’enweghị mgbochi ọbụla. N’ihi ya, ọchịchị okpuru ọchịchị ga-enwere onwe ya, agaghị m akpatụ ego ha aka chaa chaa.

“Kwa afọ, a ga-enwe oge Gọvanọ ikwu okwu banyere ọnọdụ steeti ya, a ga na-enwekwa ọgbakọ mkparịta ụka ọhaneze na ndị ọchịchị ha kwa ọnwa atọ, iji nye ụmụ amaala steeti a ohere itinye ọnụ n’usoro ọchịchị ma kwukwaa uche ha”.

Nweke kwukwara na ọ bụrụ na ya enweta ohere ịbụ gọvanọ Enugwu Steeti site n’ike nke Chukwu, na ọchịchị ya ga-ehiwe kọmịshọọnụ maka mkpesa ọhaneze bụ State Public Complaints Commission n’olu bekee, iji ụmụ amaala steeti ahụ inye mkpesa banyere ihe ọbụla metụtara ha.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close