GỌỌMENTI ANAMBARA STEETI AMACHIWO ỤMỤ AKWỤKWỌ IYI ÁKWÀ AKWỤKWỌ MBENÚKWÙ


Ọka: Gọọmenti Anambara Steeti amachiwo ụmụ akwụkwọ no na steeti ahụ iyi ákwà akwụkwọ mbenúkwù.
Ọkammụta Ngọzi Chuka-Udeh, Kọmishọna na-ahụ maka Agụmakwụkwọ na steeti ahụ ụbọchị Fraịdee, n’ụlọ ezumezu ASUBEB, n’Ọka, oge ya na ndị odeakwụkwọ Agụmakwụkwọ si n’Okpuru Ọchịchị iri abụọ na otu dị na steeti ahụ nwere ọgbakọ.
Ọkammụta Chuma-Udeh kwuru sị:
“Ụlọ akwụkwọ sekọndịrị bụ ebe a na anọ atọ ntọala maka ndị na-eto eto. O kwesịrị ka enye ụmụ akwụkwọ sekọndịrị ndụmọdụ nakwa mgbazi ziri ezi ka ha ghara igahie ụzọ.
O kwuru na ákwà akwụkwọ nwata akwụkwọ nwaanyị ọbụla nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndịrị ga – eyi ga-agaferiri ikpere ụkwụ ya.
Ọgbakọ ahụ bụ maka ịtụ alo banyere ágbà Agụmakwụkwọ ọhụrụ ga-amalite na steeti ahụ n’abalị iri na itoolu nke ọnwa Septemba afọ a.