Uncategorized
GỌỌMENTI IMO STEETI ANAPỤTALA ỤGBỌALA ITC ANỌ N’AKA ONYE “HOUSE OF REPS”


Owere: Gọọmentị Imo Steeti ebughachitela ụgbọala ndị Ụlọ ọrụ ime njem nke Steeti ahụ, ITC anọ n’aka ótù onye welitere isi n’ọchịchị Owele Rochas Okorọcha, onye nọzị n’ụlọ Nzukọ Omebeiwu Nta (House of Representatives) Naịjiriya.
Onye ọzọ Gọọmenti na-achị Imo Steeti ugbua napụtara ụgbọala ndị ITC bụ Mazị Lasbery Okaforanyanwu, onye jibu ọkwa dịka Kọmishọna na-ahụ maka Njem n’ọchịchị Rochas Okorọcha.
Hmm, “fọ nfọju akpa” “ihe a fatara n’ezie enweghị mgbe o ji eju afọ”
Kaosiladi, o nweghị onye ma ihe bụ ebumnuche ndị a wegharịzị ụgbọala Gọọmenti ka ọ bụrụ nke ha.