Uncategorized

GỌỌMENTI ỌYỌ STEETI EMECHIELA ỤLỌ ỤKA N’IBADAN MAKA MMEKPA AHỤ Ụ̀ZỤ̀

Ibadan- Gọọmenti Ọyọ steeti emechiela ótù ụlọ ụka akụrụmaka aha ya bụ Christ Life Church nke dị n’Ogige ụlọ obibi Golden Estate, Oluyole, Ibadan maka mmegide ụ̀zụ̀ ọ na-ebutere ndị bi n’ógbè ahụ.

Nkea sitere na mkpesa ndị ógbè ahụ wetara megide ụlọ ụka ahụ banyere esemokwu ha na enwe maka ihe nhịamahụ ụlọ ụka ahụ na-ewetara ha site n’oke ụ̀zụ̀ ha na-eme.

N’ozi o zigaara ndị nta akụkọ, Kọmishọna na -ahụ maka ngbasa ozi, Ọkparaeze Dotun Oyelade kọwara na site na mkpebi Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka Gburugburu, Òséụlọ (Architect) Abdulmojeed Mogbonjubola nwere banyere esemokwu nọ netiti ndi ógbè ahụ na ndị ụka ahụ maka ụ̀zụ̀, na o nweghị ihe ọzọ Gọọmenti steeti ahụ ga-eme karia omechie ụlọ ụka ahụ.

Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ndị ógbè ahụ nọgidere kpọchiwe ọnụ ụzọ ámá Ogige ụlọ obibi ahụ iji gbochie ndị ụka ahụ ịbata.

Ihe sozi bute imechi ụlọ ụka bụ na ndị ụlọ ụka ahụ jụrụ itinye aka n’akwụkwọ mkpebi sitere n’ọgbakọ ịkpa udo nke.ndi ụka ahụ na ndị ógbè ahụ nwere.

Site na nnyocha nke Mịnịstrị n’ahụ maka Gburugburu mere, nnyocha ogo ụ̀zụ̀ na-apụta n’ụlọ ụka ahụ , n’oge dị iche iche sitpe n’oge abụ otiti ruo n’oge ndị ọzọ gáfèrè decibel iri asaa na anọ (74 Db) nke megidere iwu.

Hmmm, bikonu, ime ụ̀zụ̀ abụghị ikpere Chineke

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close