Uncategorized

GỌVANỌ MAKINDE ESONYEWORO NA NGAGHARỊ IWE NLC N’IBADAN

Ịbadan – Aka na-achị Ọyọ Steeti, Sheyi Makinde anọrọla ụbọchị Tuuzdee sonyere ndi ótù jikọtara ndi ọrụ bụ Nigerian Labour Congress (NLC), Ngalaba steeti ahụ na ngagharị iwe udo ha na-eme.

O ji ohere ahụ were gwakwa ndi ngagharị iwe ahụ ótù okwu ahụ chịnchị gwara ụmụ ya, ha nwee ndidi na ihe dị ọkụ ga-emechaa jụọ oyi maka na ọ̀tanishi dị ugbua ga -akwụsị n’oge n’adịghị anya.

Ndị ọrụ ahụ malitere ngagharị iwe n’ụlọ ọrụ ndi NLC na steeti ahụ dị n’Agodi, Ịbadan, were gaa n’ụlọ ọrụ NTA, dị na Njekọrịta ụzọ Yemetu, ebe Makinde sonyere ha.

O kwuru sị, “N’ezie, a ma m na ihe isi ike nakwa ọ̀tanishi kpụ ọkụ n’ọnụ dị n’obodo ugbua. Kaosiladị, onye ọbụla nwee ndidi, ọ ga-adị mma”.

O kwekwara nkwa na akwụkwọ ozi mkpesa ha ga-eru Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu aka.

Na mbụ n’okwu ya, Kayode Martins, Onyeisioche NLC na steeti ahụ kwuru na ọ̀tanishi na agụụ na-achọzi ịtọpụ ụmụ amaala ọ̀gọ̀dọ̀ n’úkwù nke na o nweghịzi ihe kwere nzụta.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close