GỌVANỌ MBA EZIGAWORO ỤLỌ NZUKỌ OMEBEIWU AHA MMADỤ ISE ỌZỌ NDỊ GA-ABỤ KỌMISHỌNA


Enugwu– Gọvanọ Pita Mba nke Enugwu Steeti ezigaworo ụlọ nzukọ Omebeiwu steeti ahụ aha mmadụ ise ọzọ ndị ga-abụ Kọmishọna.Hon Uche Ugwu, Ọnụ na-ekwuru Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Enugwu steeti gụpụtara akwụkwọ ozi ahụ si n’aka Gọvanọ Mba ma kwuo na mmadụ ise ndị aha ha dị na ndepụta aha nke abụọ a gụnyer
Dọkịnta Martin Chinweike
Obi Ozor
Ajogwu Sunday Emeka
Chris Robert Ozongwu
Dọkịnta Felix Nnamani
N’akwụkwọ ozi ahụ nke Odeakwụkwọ Gọọmenti Steeti ahụ, Ọkammụta Chidiebere Ọnyịa tinyere aka, Gọvanọ Mba rịọkwara ndị Omebeiwu ahụ ka ha ghara igbu Oge ọbụla na ilebanye ndepụta aha ndị a ga-abụ Kọmishọna anya.
“E nwere m olileanya na ị ga-elebanye anya n’ozi a ozigbo dịka I si eme na mbụ’
Ọnụ na-ekwuru Ụlọ Nzukọ Omebeiwu ahụ kwuziri na ndị ahụ na-achọ ịbụ Kọmishọna ga-awuchi n’ihu ụlọ nzukọ Omebeiwu ahụ echi bụ Tọzdee maka ịgba ajụjụ.
Ndepụta aha mbụ Gọvanọ Mba zitere maka ime Kọmishọna dị mmadụ iri na ise. Nke a pụtara na mkpokọta aha ndị nile ọ chọrọ ime Kọmishọna dị mmadụ iri abụọ.
Nke a kwesịrị ka a jaa ya mma maka steeti ndị ọzọ nwechara ọnụ ọgụgụ Kọmishọna karịrị ole ahụ. Iji maa atụ, Gọvanọ Fransiisi Nwifuru nke Ebọnyị Steeti nwere ndị Kọmishọna mmadụ iri atọ na ise (35

