AKỤKỌ ỤWA

GỌVANỌ ORTOM NKE BENUWE STEETI EKWUOLA NA CHINEKE AGWALA YA ZỌỌ SINETI, N’AGBANYEGHỊ NA O NWEGHỊ IHE Ọ RỤRỤ DỊKA GỌVANỌ

Makurdi: Gọvanọ Samụwel Ortom nke Benuwe Steeti ekwuola hoo!haa! na Chineke agwala ya ka ọ zọọ ọkwa sineti n’afọ 2023.

Gọvanọ a kwuru nke a ụbọchị Satọdee, oge ya ndị obodo ya, Nzorov nwere ọgbakọ nke ndị eze ọdịnala na ndị ọzọ bụ ndisonwere obodo ahụ bịara.

Ọ gwara ndị be ha na ya hụrụ ọ́hụ̀ (ọ́hụ̀), ebe Chineke nọrọ gwa ya ka ọ ga zọọ ọkwa sineti, na ya bịara ịjụzị ma ha akwadoro ya bụ ọ́hụ̀.

N’okwu, Ichie Gwatse Akaahena, onye Nze na-anọchite anya mpaghara Nzorov, onye kwuru okwu n’aha ndị eze ọdịnala nakwa ndị ọchịchị ndị ọzọ gwara Gọvanọ ahụ sị, “Ee, anyị na – enye gị nkwado dịka nwa anyị ka ị gaa n’ihu zọọ ọkwa sineti ma turukwa ugo”

N’ezie Ortom tozuru ịzọ ọkwa sineti n’aha ótù ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party, PDP, iji nọchite anya mpaghara Ọdịda Anyanwụ Mgbago Úgwú (North West) Benuwe na Sineti Naịjiriya.

Kaosiladị, ọ dị mwute na nwaamadị ahụ enweghị otu mkpụrụ ihe ọ rụrụ ndị Steeti ya. Ọ bụghị ụzọ ibe ya na – arụ ka ọ rụrụ ma ya fọdụzịa ịrụ ígwè ọgbanelu (flyover) nke ụfọdụ Gọvanọ ndị ọzọ dịka Wike nke Rivas nakwa Ụmahị nke Ebọnyị na-arụ aghara aghara.

Nke ka nke bụ na ọ na-eji ndị ọrụ bekee ụgwọ. Sọọsọ ihe e ji anụ olu ya bụ iti mkpu banyere ihe Onyeisiala Buhari na ụmụnne ya ndị Fulani na – eme ndị be ha.

Hmmm, “Mazị Ortom,” ụzụ amaghị akpụ ogene, lee egbe anya n’ọdụ”. Gọvanọ Wike na – akatọ ihe ọjọọ ọbụla Buhari mere mana o gbochighi ya iji ego ndị Rivas Steeti wee na-arụrụ ha ọrụ”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close