GỌVANỌ YAHAYA BELLO ECHETARALA NDỊ NTOROBỊA IBE YA NA GỌVANỌ ỌBỤLA KETARA ÒTÙ IJERI NAIRA (N1BN) MAKA ỌRỊA KORO


Lokoja – Gọvanọ Yahaya Bello nke Kogi Steeti nọrọ ugbua na Mmemme Sunrise Daily nke ụlọ mgbasa ozi Channels TV were chetakwara ndị “ntorobịa ala Naịjiriya” íbe ya na Gọvanọ Steeti nile nọ na Naịjiriya ketara akatamkpo ego dị òtù Ijeri Naira n’aka Gọọmenti Etiti iji buo agha megide Ọrịa Koro.
N’oge ọ na-aza ajụjụ banyere mwakpo ọhaneze na-awakpo ụlọ nchekwa erimeri e kwesịrị íkesa iji belata ihe nhịamahụ Ọrịa Koro nke na-akpọtụ n’akụkụ Naịjiriya nile ugbua, Gọvanọ Bello na ọ bụ ya onwe ya na anochiteanya ndị ntorobịa na Gọọmenti dịka onye ntorobịa bụ Gọvanọ.
N’agbanyeghị na Mazị Boss Mustapha, Odeakwụkwọ Ukwu Ala Naịjiriya, ma bụrụkwa Onyeisi Oche òtù ọrụ aka ọkụ Gọọmenti Etiti hiwere maka Ọrịa Koro kwupụtwara nke n’abalị iri abụọ n’otu nke ọnwa Septemba, ọ dị ka ọ bachaghị ndị ntorobịa ntị nke ọma.
Maka ihi ngagharị iwe #EndSars nakwa nchọpụta a chọpụtara na ọtụtụ Steeti kpọchikọrọ erimeri ha kwesịrị ikesara ọhaneze iji belata ihe nhịamahụ ọrịa koro, okwu Gọvanọ Bello meziri ka anya na enwuzi ndị ntorobịa ọkụ.
Ha chọrọ ịjụ ndị Gọvanọ ihe ha ji ego ahụ mee iji belata ihe nhịamahụ na nsogbu sitere n’ọrịa ahụ na Steeti ha.
Gọvanọ Bello kwukwara na o nwere akatamkpo ego ọzọ dị òtù Ijeri Naira na òtù Nde Ótù ụlọ akụ Mbaụwa na enyekwa site nile ugbua.
O kwukwara na ọtụtụ ji ya bụ Ọrịa Koro were baa onwe ha ọgaranya.
Ugbua, ndị ntorobịa na Steeti nile na ejikere ịjụ Gọvanọ nke ha ihe ya na akatamkpo ego ahụ jere…