NKE NA-EME UGBUA

“HAPỤGODI SWAT, KPỌỌ ỌGBAKỌ NDỊ NILE OKWU #ENDSARS GBASARA” – ÓTÙ NDỊ GỌVANỌ NAỊJIRIYA

Abụja : Ótù jikọtara ndị Gọvanọ Steeti nile nọ na Naịjiriya bụ Nigerian Governors’ Forum (NGF) agwala Onye Nlekọta Ukwu nke ndị Uwe Ojii Naịjiriya (IGP), Mohammed Adamu ka ọ hapugodi okwu maka ihiwe ngalaba ndi Uwe Ojii ọhụrụ a kpọrọ SWAT, ma burugodi ụzọ kpọọ ọgbakọ ndị nile okwu ngagharị iwe #EndSars gbasara.

Ozi si n’aka ótù ahụ nke Onyeisi Oche ma bụrụkwa Gọvanọ Ekiti Steeti, Dọkịnta Jọọnụ Kayode Fayemi tinyere aka kwuru na ha na Onye Nlekọta Ukwu nke ndị Uwe Ojii, Mohammed Adamu nwere ọgbakọ banyere ngagharị iwe #EndSars, ebe ha kelere ya maka mbọ ya nile idozi okwu ahụ.

Ha kelekwara Onyeisiala Muhammadu Buharị maka mbọ ya ịkatọ arụrụ ala ndị SARS.

Kaosiladi, ótù NGF nyere IGP Mohammed Adamu ndụmọdụ ka ọ hapugodi ihiwe ngalaba ọhụrụ a kpọrọ SWAT iji nọchie SARS ganye na ọ kpọọ ọgbakọ ndị nile okwu ngagharị iwe #EndSars nakwa okwu nchekwa gbasara na Naịjiriya

“Ótù NGF na-akpọku IGP Mohammed Adamu ka ọ hapugodi okwu maka ihiwe ngalaba ndi Uwe Ojii ọhụrụ a kpọrọ SWAT ugbua.

“Nkea bụ maka na ọtụtụ mmadụ ga-aghọtahie ya, n’agbanyeghị ezigbo ebumnuche ya.

“Ihe kacha mkpa ugbua bụ ịkpọ ọgbakọ ndị nile okwu ngagharị iwe #EndSars gbasara maka inwe nkwekọrịta tọ́rọ̀ àtọ̀ banyere okwu ahụ”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close