AKỤKỌ ỤWA

HAPỤNỤ OKWU OKPUKPERECHI BINYERENU LP AKA, ỌCHỊCHỊ DORO ANYỊ ANYA – DATTI-AHMED NA-AGWA NDỊ NAỊJIRIYA

Sinetọ Yusuf Baba Datti-Ahmed, onye ji aha òtù ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Party, LP azọ ọkwa Osote Onyeisiala ejiriwo obi ya nile were rịọ ụmụ amaala Naịjiriya ka kwado ndị ọchịchị doro anya maka idozi Naịjiriya, n’agbanyeghị usoro okpukperechi onye eso.

Ya bụ nwaamadị, onye nwe Mahadum Baze n’Abụja kwuru nke a taa n’ọba ozi mmekọrịta Twitter.

O kwuru sị:

“Unu ebinyerela m aka maka na m bụ Onye Alakụba. Unu ebinyerela Obi aka maka na ọ bụ Onye Ụka.

“Binyerenu anyị aka maka na unu matara n’ime ala ala obi unu na oge eruola anyị ga-eji wegharakwa aha eji mara anyị nke bụ ” ODOGWU AFRỊKA”

“Binyerenu anyị aka maka na unu kwenyere na ọchịchị doro anyị anya”

Hmmm, “Ọchịchị kakwa mma! N’onye o doro anya! Úkwù n’ahịa, ọgọdọ n’ahịa…..”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close