AKỤKỌ ỤWA

ỊBỤ NWUNYE BỤ ỌRỤ KWESỊRỊ ỊNA-ERI ỤGWỌ ỌRỤ – ỌKAIKPE

Ọkaikpe Teresia Matheka nke ụlọikpe ukwu Nairobi, Kenya ekpebiela na ịbụ nwunye bụ ọrụ kwụrụ onwe ya kwesịrị na-eri ụgwọ ọrụ.

Na mkpebi ya, n’okwu esemokwu di na nwunye, Ọkaikpe ahụ kwuru na o zighi ezi ịsị na o nweghị ego ọbụla nwanyị na – elekọta ezinụlọ na-ewebata n’ụlọ.

“Ọ dị mfe nwoke ịzọkọrọ akụnụba nile, na ọ bụ ego ọ kpatara ka e jiri zụọ ha mana ọ bụ nwanyị nọ n’ụlọ jiri ego ahụ were nweta akụnụba ndị ahụ.

“Ọzọkwa, ilekọta ụmụaka anya bụ ọrụ ezinụlọ ụfọdụ na – akwụ mmadụ ụgwọ maka ya. Etu a ka ọ dịkwa isi nri na idebe ụlọ ọcha.”

Nwanyị gbara akwụkwọ n’ụlọ ikpe bụ nwanyị ya na di ya gbaworo alụkwaghịm, onye chọrọ ka e ree akụnụba nile ezinụlọ ahụ nwere, ka ya na nwoke ahụ kee ego ya ụzọ abụọ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close