AKỤKỌ ỤWA

ÍBÚ Ọ́GWỤ̀ IKE: ATỤWO MAZỊ OKAFỌ NA NWUNYE YA IFEYINWA NGA

Legọs – Ọkaikpe Nicholas Oweibo nke Ụlọikpe Etiti na Legọs nọrọ ụbọchị Wenezdee were tụọ Mazị Ikechukwu Okafọ na nwunye ya, Ifeyinwa nga afọ abụọ maka íbú ọ́gwụ̀ ike.

Ndị na nwunye a bi n’Ago Palace Way, Ọkọta, Legọs kwetara na ikpe mara ha n’ebubo íbú kilograms 19.12 nke Methamphetamine bụ ọ́gwụ̀ ike iwu machibidoro.

Mazi A. G. Yaunyam, onye ji okwu ahụ n’ụlọikpe kwuru na mmadụ abụọ ahụ nọrọ n’abalị ise nke ọnwa Ọktoba afọ a, mee ya bụ no megidere isiokwu 14, 19 na 11(c) nke iwu NDLEA nke obodo Naijiriya.

Kaosiladị, Ọkaikpe ha, Benson Ndakara rịọrọ ọkaikpe ahụ ka o meere ha ebere, maka na nke a bụ mbụ ha na ádà Iwu ọbụla.

Ọkaikpe Oweibu jizi maka ya were tụọ ha nga afọ abụọ ma nyekwa ha ohere ịha nha otu nde Naịra na ọkara, iji gbalahụ ịga nga.

Hmmm, ogologo akpịrị arapụtawo di na nwunye a. Kedu ihe ha ga akọrọ ụmụ ha?

Ikekwe, ha na-achọ ibute ego ekeresimesi. Chai!

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close