ICHI SULTAN NA BINI: GỌỌMENTI EDO STEETI AGAGHỊ ANABATA UDIRI MKPARỊ AHỤ CHAA CHAA


Bini: Gọọmenti Edo Steeti ejirila mgbarụ ihu were katọọ echichi Alahaji Idrissi Adanno na-achọ ichi dịka ‘Sultan ndị Shuwa Arab n’ Edo Steeti’ n’abalị iri abụọ n’abụọ nke ọnwa Ọgọọst afọ a na Bini.
Ozi nke Odeakwụkwọ Gọọmenti Edo Steeti, Ọkaiwu Osarodion Ogie, tinyere aka mere ka ụmụ amaala steeti ahụ mata na Gọọmenti Edo Steeti egosi ndị ọbụla aka ya dị ya bụ ‘nsọ ala’ ihe ọkụ ji ntị oke eme.
“Gọọmenti Edo Steeti na-ekwu hoo!haa! na – asị: Ichi echichi ahụ ebe ọbụla n’Edo Steeti ga-abụ mkparị nye omenala na usoro obibi ndụ ndị Edo Steeti, site n’aka ndị chọrọ ibute ọgbaghara na steeti a bụ ebe a natara nke ọma dịka ndị ọbịa.
“Site n’iwu Ndị Eze ọdịnala na Echichi nke Edo Steeti, o megidere iwu bụ mmadụ iji aka were chie onwe ya eze, ma ọ bụ kweta ka e chie ya eze”
Hmmm, a na-ekwu nke ha mere, ha a na-eme ọzọ!