AKỤKỌ ỤWA

ICPC, DSS ANWỤCHIKỌWO NDỊ NKUZI MAHADUM NAKWA ỤFỌDỤ NNE NA NNA MAKA NTAPU ÙLÉ

Ụlọ Ọrụ Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission (EFCC) nakwa nke Department of State Services (DSS) anọrọwo na mwakpo a kpọrọ “Operation Combo” ha jkọrọ aka mee were nwụchikọọ mmadụ iri anọ na asatọ maka ntapu ùlé Joint Universities Preliminary Examinations Board (JUBEP).

JUPEB bụ ùlẹ́ nke nwata akwụkwọ nwere ike isi banye n’afọ nke abụọ na mahadum.

Mahadum Legọs bụ ya na-achịkọba ya site n’enyemaka mahadum iri ndị ọzọ na Naịjiriya.

Na mwakpo ahụ, ndị e jidere gụnyere ndị nkụzi mahadum, ndị ọrụ nakwa ụmụ akwụkwọ.

Ozisitere n’aka Mazi Azụka Ọgụgụa, Ọnụ na – ekwuru Ụlọ ọrụ ICPC kọwara na ụfọdụ ndị nne na nna so ndị aka kpatara na mwakpo ahụ e mere na steeti asaa site na ime nnyocha nke were ha ọnwa ole na ole.

Ebe ee jidegasịrị ndị a gụnyere ogige nkụzi (tutorial centers) ndi nọ na Mahadum McPherson, Ịbadan, Oyo Steeti, Mahadum Wellspring University, Bini, Edo Steeti nakwa mahadum Christopher University, Mowe, Ogun Steeti.

Ozi ahụ kwukwara na ndị isi mahadum (Vice Chancellors) atọ so na ndị a na-agba ajụjụ ọnụ maka ya bụ ntapu ùlé, ha si na ya anapụ ndị na-achọ ịba mahadum ego sitere na Narị Puku Naịra atọ na iri ise (N350,000) ruo Narị puku Naịra ise (N500,000)

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close