AKỤKỌ ỤWA

IDINA NWANYỊ N’IKE NA-ATỌ M ỤTỌ PỤRỤ ICHE – AZEEZ

Oshogbo: Quadri Azeez, nwokorọbịa dị afọ iri abụọ agwala ụlọikpe Majie n’Oshogbo na iwakpo ụmụ nwanyị dinaa ha n’ike na-atọ ya ụtọ pụrụ iche.

A kpọtara ya bụ ekperime n’ihu ụlọikpe Majie ahụ maka iwakpo ma dinaa ótù nwa agbọghọ n’ike n’abalị isii nke ọnwa Maachị afọ a. O merụkwara nwa agbọghọ áhụ̀ àhụ́.

Azeez kwuru sị, “ Oge ọbụla nwa agbọghọ ọbụla gafere ebe m nọ, agụụ idina ya n’ike na-eju m isi. Nne na nna m kpọrọ gaa ebe dị iche iche iji kwụsị nsogbu ajọ mmụọ a tupu m were dinaa nwa agbọghọ a n’ike. Nkea bụ mbụ m na-edina nwanyị n’ike”

Inspector Elisha Olusegun, Onye Uwe Ojii ji ikpe ahụ gwara ụlọikpe Majie ahụ na Azeez nọrọ n’abalị isii nke ọnwa Maachị afọ 2021, n’ebe Ara, dị n’Ede, were wakpo, merụọ ahụ ma dinaa n’ike ótù nwa agbọghọ (onye a kpọghị aha) bụ nke megidere iwu Osun Steeti nke Naịjiriya nke afọ 2002.

Majie Olusegun Ayilara tiri iwu ka a kpọchigodu ekperime ahụ n’ụlọ nga ruo oge ọzọ a ga-akpọlite okwu ahụ.

Show More

Related Articles

One Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close