AKỤKỌ ỤWA

IFE ARỤSỊ BỤZỊ IHE NA-EWU EWU N’ETITI NDỊ NTOROBỊA ANAMBARA – SOLUDO

Soludo na-akpagbu ndị omenala – Akpe – Ọnwụka

Ọnịcha: Aka na-achị Anambara Steeti, Ọkammụta Chukwuma Soludo akwaala arịrị etu ife arụsị si ewuzi na steeti ahụ, ọ kacha n’etiti ndị ntorobịa.

Soludo rịọzịrị ndị ụka na steeti ahụ ka ha lebara ya bụ ajọ ọnọdụ anya tupu ndị ótù amoosu eweghara steeti ahụ.

O kwuru nkea ụbọchị Mọnde na mmemme nnyefe n’aka Chineke nke ụlọ ụka House of Testimony, Life of Faith Gospel Assembly, Federal Housing Estate, Ọnịcha nke a rụrụ ọhụrụ.

Ọ kọwara Anambara dịka steeti Chineke ma rịọ ndị ụka niile ka ha jikọọ aka ọnụ dịka ótù ahụ Jeso Kristi, iji buso “ndị ekperime” ahụ agha.

“A bịara m ịdọnyere ndị ụka ụkwụ iji buo agha megide ife arụsị na steeti a nke na-ewuzi ewu, ọ kacha n’etiti ndị ntorobịa”

Kaosiladị, ndị omenala na steeti ahụ agbarụwo ihu n’ihe ha hụtara dịka mkpagbu sitere n’aka Gọvanọ Soludo.

Ótù onye omenala, Nze Ugo Akpe Ọnwụka ka tọrọ etu Gọvanọ Soludo sịrị agụnye ndị omenala nile na steeti ahụ dịka ndị ekperime na ndị arụrụala

“Ọ jọgburu udele ma si gbuo nkakwụ, etu Gọvanọ Soludo siri akparị ma na-akpagbukwa ndị omenala n’Anambara Steeti site na ịgụnye ha nile na ndị omekome.

“Nkea megidere iwu ala Naịjiriya nke nyere nwa amaala ọbụla ikike ịgbasoro udiri usoro okpukperechi ọbụla masịrị ya, n’atụghị ụjọ mkpagbu.

Ọ jụrụ ihe mere Soludo ji akatọrọ ndị omenala nile maka ndị dibịa nakwa ụfọdụ ndị omenala na-etinye aka na ime mpụ mana o sighi etu ahụ akpagbu ndị ụka maka ndị ụka sokwa emebi obodo.

Hmmm, égbé bere ugo bere. Ka udo chịa

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close