IFE ARỤSỊ: NDI NTOROBỊA IJIZI YA ANYA ISI JỌGBURU ONWE YA – SOLUDO



Nnewi – Aka na-achị Steeti Anambara, Ọkankuzi Chukwuma Soludo ekwuwo hoo!haa! na ife arụsị, nke na-arịzị ibe ya elu n’Ala-Igbo taa, ọ kacha n’etiti ndi ntorobịa dịka ihe jọgburu udele ma sigbuo nkakwụ.
N’okwu ya n’ọgbakọ ukwu (synod) nke isii nke ndị ụka Angịlịkaanụ, Dayọsiisi Amichi nke isiokwu ya bụ:”Ife arụsị:Ihe na-akpata ya, ihe ọ na-ebute makwa ọgwụ ya”, Soludo, onye nke Osote ya bụ Onyekachukwu Ibezim, nnọchiteanya ya, bunyere Bishọọpụ Ikeakọ ụkpa ekele maka ya bụ synod siri gazie tinyekwara etu isiokwu ha họtara ji bụrụ nke dabara adaba.
O kwuru na ndi na-ebuso Obodo Naịjiriya agha hụ ndị a maara dika ‘Unknown Gun Men’, n’agbanyeghi na a ma ndi ha bụ, jizi ife arụsị were hiwe isi n’udiri pụrụ iche.
Soludo na oge ọbụla ndị ọrụ nchekwa wakporo ogige nzuzo ha, na a na-ahụ arụsị nakwa ọtụmọkpọ dị iche iche, nke ha na-emebikwa ma suo ọkụ.
O kwukwara na ya bụ isiokwu synod ahụ kwesịrị ịbụ isiokwu nye ndi ụka nile nọ na steeti ahụ, iji hụ na a chụrụ ife arụsị ọsọ ụkwụ eru ala.
Soludo gwakwara ndi nne ka ha nye ụmụaka ha ndụmọdụ banyere izeere ife arụsị, ma werekwa ndụ ha mee ihe bara uru.
N’okwu ya na bụ mmemme e mere abalị atọ n’Ụlọ Ụka Angịlịkaanụ Ịmanụwelụ Ekwulumili, dị n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Nnewi South na Steeti Anambara, Bishọọpụ Ifreemu Ikeakọ kwara arịrị etu Naịjiriya, obodo Chineke gọziri agọzi si nọrọ n’oke ihe isi ike maka enweghi ezigbo ndị ọchịchị.