MMEMME
ỊGBA NKWỤ CHINEMEREM, ADA AIR COMMODORE BEN UGWUEKE
Enugwu: Ụbọchị Tuuzdee, abalị isii nke ọnwa Eprel afọ 2021 bụ oke ụbọchị n’Ụmụẹ̀gwụ̀, Ugwu ọkpa, Emudo – Nenwe nke dị n’Okpuru Ọchịchị Anịnri, Enugwu Steeti.
Ụbọchị ahụ ka Ọkaiwu Chimezie Ogenna Nwodo, onye Ọnụafọ-Aniede-Isigwe dị n’Ogonogo Eji, Ndiagu Akpugo n’Okpuru Ọchịchị Ọdịda Anyanwụ Nkanụ du ikwu na ibe nakwa ndị enyi ya were wụchie na nke Ọchịagha Ụgbọelu Air Commodore Ben Ugwueke laworo ezumike nka maka ịgba nkwụ ada ya, Ọkaiwu Chinemerem Ugwueke.
Igba nnkwụ ahụ wuru ewu ma kpọtụkwaa akpọtụ. Ụfọdụ ndị nwere àgbà bịara mmemme ahụ gụnyere; AVM Kris Ndubuisi Chukwu laworo ezumike nka, AVM Godwin Ọpara, A. O. C., Enugwu, Ọkaikpe Nnenna Alukwu, wdg.