Aba : Leenụ nke na-ewuzi ugbua! Igbotic Agbamakwụkwọ. Di na Nwunye yi uwe ejirimara Ndigbo bụ Isiagụ were mee agbamakwụkwọ n’ụlọ ụka.
Bikonu, onye hụrụ Mazị n’Oriakụ Emeka Oguamalam kelee ha, ha bụ odogwu. Onye mee ihe dị egwu, ọ bụrụ dike bụrụkwa Odogwu. Onye mee ihe dị ike, ọ bụrụ dike.
Ha mere agbamakwụkwọ ha n’Ụlọ Katọliki Onye Nsọ Pita dị na Nguzu Edda, n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Afikpo, Ebọnyị Steeti.