NKE NA-EME UGBUA

IHE NKIRI:MMESỌMA, ONYE NDI NCHE ỌHỊA ENUGWU STEETI ZỌPỤTARA N’AKA NDI NTỌ NDI FULANI AKỌỌLA IHE ANYA HA HỤRỤ

Enugwu – Nwa-ada Mmesọma Chukwura, onye Anambara Steeti ekelewo Chineke maka isi n’aka ndị Nche Ọhịa Enugwu Steeti, Ngalaba nke Okpuru Ọchịchị Udi were zọpụta ya na ndị ọzọ n’aka ndị ntọ ndị Fulani mmadụ ise.

Site n’okwu ya, ụbọchị ụka a, ka ya na ụmụ nwanne ya na nne ha gara n’ugwu ime ngagharị nke obe ka ụka gbasara, ndị Fulani wakporo ha, sụọ ya mma n’anya were tọrọ ha.

O kwuru na ndị ntọ ahụ gosiri ha ozu di na nwunye ha gbùrù were gwa ha na ha ga-egbu ha ma ha enwetaghị Nde Naira Iri na Ise.

Ha rịọtazịrị ha otu nde Naira n’ọkara nke ndi be ha gara dọsa n’ebe a gwara ha.

Kaosiladị, ndị nche ọhịa Enugwu Steeti Ngalaba Okpuru Ọchịchị Udi wakpoziri ndị ntọ ahụ were zọpụta ha.

“Ka anyị na-ekele ndị nche ọhịa Enugwu Steeti, Ngalaba Udi, anyị na-arịọ ka Gọọmenti sụọ ọhịa nile ebe ndị omekome a makpu etu e siri mee n’Agụ Udene, Àkpóọ́fụ̀, ebe ndị omekome ndị òtù Saịmọnụ Ekpa nwere àkwụ́ (Den)

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close