AKỤKỌ ỤWA

IJI SWAT NỌCHIE SARS DỊ KA IJI PHCN NỌCHIE NEPA-RENO OMOKRI

Reno Omokri, onye bụbu Onye Inyeaka Onyeisiala Gudlọk Jọnatan ekwuola na iji ngalaba ndi Uwe Ojii ọhụrụ a kpọrọ SWAT (Special Weapons and Tactics) were nọchie ngalaba SARS (Special Anti-Robbery Squad) enweghị isi maka na ọ ga-adị ka oge Gọọmenti jiri PHCN nọchie NEPA.

Chetakwa na Onye Nlekọta Ukwu nke ndị Uwe Ojii (IGP) Naịjiriya kwuru na SWAT ga-anọchizi SARS o kposara maka ngagharị iwe #EndSars na-akpọtụ ugbua n’ihi arụrụ ala ndị ótù ahụ.

N’ozi ya na Twitter, Omokri kwuru hoo!haa! na ịgbanwe ngalaba ndị Uwe Ojii ahụ site na SARS bazịa na SWAT enweghị mgbanwe akparamagwa ọbụla ọ ga eweta na ndụ ndị Uwe Ojii ahụ maka na “Onye rere nkịta zuru zụrụ enwe, na ya na ihe ntukwu ntukwu ka na – eme”

N’ezie, ọ bụ echiche dị otu a mere na ngaghagrị iwe #EndSars ka na-aga n’ihu n’agbanyeghị na asị na e kposaala SARS.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close