IJI ỤRA SAA ỤKỌCHUKWU ALAKỤBA NTỊ EBUTEWORO GỌVANỌ BAGO NKE STEETI NAỊJA NKATỌ
Mịna – Aka na-achị Steeti Naịja Mohammed Bago, anatawo nnukwu nkatọ maka idinye ndi ọrụ nchekwa na-eso ya ka ha jiri ụra saa ótú ụkọchukwu alakụba ntị ebe a nọ na mmemme.
N’Ihe nkiri gbasaworo n’ọbaozimbaụwa, Bago nyere ndi ọrụ nche na-eso ya ntimiwu ka ha maa ụkọchukwu alakụba ahụ ụra.
“Maa ya ụra, machie ya ntị. A sị sị maa ya ụra. Kpụrụ ya kpọchie. Mesie ya ike, ọfụma ọfụma!”
Onye ọrụ nchekwa, Department of State Services gara dọkpụlite nwoke ahụ ebe o sekpu ala n’etiti ìgwè mmadụ, were jiri ụra machie ya ntị, ma tikwaa ya ihe.
Ụfọdụ ndị nọ ebe ahụ chịwara ọchị ka Gọvanọ Bago nyere ntimiwu ahụ.
O dobeghi anya bụ ihe nwoke ahụ mere mana ụfọdụ na-ekwu na ọ chọrọ ikpe ekpere mmechi na mmemme ahụ nke Gọvanọ ahụ akwadoghi.
N’okwu ọ gwara ndi nta akụkọ, onye ọkaiwu maka ikike dịịrị mmadụ, Mazị Deji Ajare, katọrọ akparamagwa Gọvanọ ahụ nke ọ sị megidere ikike dịịrị mmadụ nke ụkọchukwu alakụba ahụ.
Kaosiladị, Odeakwụkwọ mgbasa ozi Ukwu nke Gọvanọ ahụ, Bologi Ibrahim, gọrọ aka ya na ụkwụ ya, ma kwuo na ya amaghị banyere ya.